Amos 8

Nkata mkpụrụ chara acha

1Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara. 2Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?”

A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.”

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”

3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”
Ya bụ, ebe ọbụla dere juu


4Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa,
na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,
5na-asị,

“Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe
ka anyị ree mkpụrụ ubi,
na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ
ka anyị ree ọka wiiti?”
Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta,
na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu,
na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.
6Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye,
jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa,
ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.
7 Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”

8Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a,
ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ?
Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl,
a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa
dịka iyi Ijipt.
9“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,

“Aga m eme ka anyanwụ daa
Ya bụ, ime ka chi jie
nʼetiti ehihie,
ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
10Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ;
gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa.
Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe,
meekwa ka unu kpụchaa isi unu.
Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ.
Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.

11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala,
ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri,
kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.
12Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ,
sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ;
ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị,
ma ha agaghị achọta ya.
13“Nʼụbọchị ahụ,

“ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike
ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
14Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi,
Nʼaha Ashima bụ arụsị

ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’
nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’
ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”
Copyright information for IboBIU